1 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka ewe ghara ime ka unu ma n'ọnyà.
2 Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.
3 Ihe ndia ka ha gēme kwa, n'ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu.
4 Ma okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n'ihi na Mu na unu nọri.
5 Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla?
6 Kama n'ihi na M'gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu.
7 Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu.