24 Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.
25 Agwawom unu ihe ndia n'ilu: oge hour nābia, mb͕e M'nāgaghi-agwa unu okwu n'ilu ọzọ, kama M'gāgwawa unu okwu bayere Nnam.
26 N'ubọchi ahu unu gāriọ n'aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n'ihi unu;
27 n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta.
28 Esirim na Nnam puta, abiawokwam n'uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam.
29 Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu.
30 Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n'ebe Chineke nọ puta.