27 n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta.
28 Esirim na Nnam puta, abiawokwam n'uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam.
29 Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu.
30 Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n'ebe Chineke nọ puta.
31 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bu ub͕u a ka unu kwere?
32 Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ.
33 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.