7 Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu.
8 Onye ahu, mgbe Ọ gābia, Ọ gātu kwa uwa nmehie, na ezi omume, na ikpé, n'anya:
9 nmehie, n'ihi na ha ekweghi na Mu;
10 ezi omume, n'ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n'ub͕u a;
11 ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.
12 Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.
13 Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.