7 Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret.
8 Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la:
9 ka okwu O kwuru we mezu, si, N'etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M'tufuru.
10 Ya mere Saimon Pita, ebe o ji mma-agha, ọ miputa ya, b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma aha orù ahu bu Malkọs.
11 Ya mere Jisus siri Pita, Miye mma-agha-gi n'ọbọ-ya: iko nke Nnam nyeworom, M'gaghi-aṅu ya?
12 Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u,
13 we buru uzọ duru Ya jekuru Anas; n'ihi na ya bu nna nwunye Kaiafas, onye bu onye-isi-nchu-àjà arọ ahu.