13 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n'èzí, we nọkwasi oche-ikpé n'ebe anākpọ Pavement, ma n'asusu Hibru, Gabata.
14 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu!
15 Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.
16 Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe.
17 Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta:
18 ebe ha kpọgidere Ya n'obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n'akuku a otù n'akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n'etiti ha.
19 Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.