11 Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.
12 Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.
13 Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.
14 Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala:
15 O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru;
16 Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia.
17 Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam.