4 Ha abua we b͕a ọsọ n'otù: onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus we b͕a kari Pita, buru uzọ biarue ílì ahu;
5 o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime.
6 Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ,
7 ichafọ kwa, nke diri n'isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n'otù ebe, kama aturuworo ya debe n'otù ebe di iche.
8 Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa.
9 N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie.
10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha.