5 o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime.
6 Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ,
7 ichafọ kwa, nke diri n'isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n'otù ebe, kama aturuworo ya debe n'otù ebe di iche.
8 Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa.
9 N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie.
10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha.
11 Ma Meri nēguzo n'èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì;