1 Ya mere mb͕e Onye-nwe-ayi mara na ndi-Farisi nururi na Jisus nēme madu ka ha buru ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ nēme kwa ha baptism, kari Jọn,
2 (ọ bu ezie na Jisus onwe-ya emeghi baptism, kama ọ bu ndi nēso uzọ-Ya),
3 Ọ rapuru Judia, we je Galili ọzọ.
4 Ma Ọ ghaghi igabiga n'etiti Sameria.
5 Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef:
6 ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi.
7 Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M'ṅua.