13 Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ:
14 ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi.
15 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri.
16 Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a.
17 Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di:
18 n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie.
19 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma.