49 Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi.
50 Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya.
51 Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu.
52 Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya.
53 Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.
54 Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.