27 O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu.
28 Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya,
29 ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé.
30 Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.
31 Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie.
32 Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie.
33 Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà.