30 Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.
31 Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie.
32 Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie.
33 Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà.
34 Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu.
35 Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge.
36 Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.