8 Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari.
9 Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari.Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu.
10 Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n'iwu ka i chiri ute-gi.
11 Ma ọ zara ha, si, Onye mere ka aru dim nma, onye ahu sirim, Chiri ute-gi, nējeghari.
12 Ha juru ya, si, Ònye bu Madu ahu Nke siri gi, Chiri ute-gi nējeghari?
13 Ma onye ahu emere ka aru di ya ike amataghi Onye ọ bu: n'ihi na Jisus wezugarari Onwe-ya, n'ihi na ìgwè madu di n'ebe ahu.
14 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi.