1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n'ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias.
2 Oké ìgwè madu we so Ya, n'ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n'aru ndi aru-ha nādighi ike.
3 Jisus we rigo n'ugwu ahu, n'ebe ahu ka Ya na ndi nēso uzọ-Ya nọdu-kwa-ra ala.
4 Ma ngabiga, bú ememe ndi-Ju, di nso.