57 Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n'ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n'ihim.
58 Nka bu nri ahu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
59 Ihe ndia ka O kwuru n'ulo-nzukọ, mb͕e O nēzí ihe na Kapanaum.
60 Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya?
61 Ma ebe Jisus mara n'Onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya nātamu ntamu n'ihi nka, Ọ siri ha, Ọ̀ bu nka nēme ka unu ma n'ọnyà?
62 Ùnu agaghi-amakari kwa n'ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n'ebe Ọ nọri na mbu?
63 Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu.