6 Ma nka ka O kwuru inwa ya: n'ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime.
7 Filip zara Ya, Ob͕e achicha ọgu shilling iri agaghi-ezu ha, ka madu nile n'otù we were nke-ntà nke-ntà.
8 Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya,
9 Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a?
10 Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n'ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n'ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri.
11 Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra.
12 Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n'iyì.