64 Ma ufọdu ndi nēkweghi di n'etiti unu. N'ihi na Jisus mara site na mbu ndi ha bu ndi nēkweghi, na onye ọ bu nke gārara Ya nye.
65 O we si, Ọ bu n'ihi nka ka M'siworo unu, na ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na enyeghi ya site n'aka Nnam.
66 Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ.
67 Ya mere Jisus siri ndi-ozi iri na abua ahu, Ùnu onwe-unu nāchọ kwa ila?
68 Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi.
69 Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke.
70 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bughi Mu onwem rọputara unu, bú ndi-ozi iri na abua, ma otù onye nime unu bu nwa ekwensu?