16 Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem.
17 Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem.
18 Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya.
19 Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um?
20 Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi?
21 Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M'luru, o we nēju unu nile anya.
22 Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù.