9 Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili.
10 Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n'iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo.
11 Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n'ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ?
12 Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.
13 Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju.
14 Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe.
15 Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ?