8 O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala.
9 Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti.
10 Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé?
11 O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ.
12 Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.
13 Ya mere ndi-Farisi siri Ya, Gi onwe-gi nāb͕ara Onwe-gi àmà; àmà nke Gi abughi ezie.
14 Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla.