15 ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;
16 ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n'otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya:
17 O we bia zì unu ndi nọ n'ebe di anya ozi ọma nke udo, zì kwa ndi nọ nso ozi ọma nke udo:
18 n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.
19 Ya mere otù a unu abughi ndi-ọbìa na ndi nānọ dika ọbìa ọzọ site n'ub͕u a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amuru n'ala, unu bu kwa ndi èzi-na-ulo Chineke,
20 ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;
21 ọ bu kwa nime Ya ka ulo nile ọ bula anēwu n'ulo ahu, ebe anējikọ ha nke-ọma, nāba uba we buru ulo nsọ nime Onye-nwe-ayi;