11 dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi:
12 ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.
13 N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu.
14 Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi,
15 Onye esitere na Ya gu eriri-nna nile ọ bula n'elu-igwe na n'elu uwa aha,
16 ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu;
17 ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya,