18 Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;
19 nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;
20 nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;
21 nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.
22 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi.
23 N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.
24 Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula.