6 Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye.
7 Ya mere, unu esola ha kekọ ihe;
8 n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè
9 (n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile),
10 nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma;
11 unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;
12 n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.