11 ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.
12 Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru;
13 ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n'ebe ndi nile fọduru nọ;
14 o me kwa ka ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n'ab͕um.
15 Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma:
16 ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma:
17 ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um.