16 náni nka, n'ihe ahu ayi b͕aruru, ka ayi nāgazi dika ihe ahu si di.
17 Umu-nnam, dinu n'otù n'iṅomim, nēle-kwa-nu ndi nējeghari otú a, otú unu nwere ayi dika ihe-atù
18 N'ihi na ọtutu nējeghari, ndi m'nāgwari unu okwu bayere ha ọtutu oge, ma ub͕u a ọ bu kwa n'ákwá ka m'nāgwa unu, na ha bu ndi-iro obe nke Kraist:
19 ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.
20 N'ihi na ala-ayi di n'elu-igwe ub͕u a; site n'ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:
21 Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.