19 Ma Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n'ebube si di, nime Kraist Jisus.
20 Ma otuto diri Chineke-ayi, bú Nna-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
21 Kelenu onye nsọ ọ bula nime Kraist Jisus. Umu-nna-ayi ndi mu na ha nọ nēkele unu.
22 Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n'ikele unu.
23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.