2 Náni nka ka m'nāchọ imata n'ọnu-unu, Ùnu sitere n'ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n'ọnunu nke okwukwe nata Ya?
3 Ùnu bu ndi nēnweghi uche otú a? ebe unu malitere na Mọ Nsọ, ọ̀ bu n'anu-aru ka anēme ka unu zue okè ub͕u a?
4 Ùnu huru ọtutu ahuhu di otú a n'efu? ma asi na ọ bu ezie na unu huru ha n'efu.
5 Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya?
6 Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n'ezi omume.
7 Ya mere maranu na ndi sitere n'okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham.
8 Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.