10 Unu nēlezi anya idebe ubọchi, na ọnwa, na oge, na arọ.
11 Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu.
12 Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:
13 ma unu matara na ọ bu n'ihi adighi-ike nke anu-aru ka m'zìri unu ozi ọma na mbu:
14 unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus.
15 Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.
16 Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu?