2 kama ọ nọ n'okpuru ndi etiyere ya n'aka-ha na ndi nāchi èzí-na-ulo-ya rue oge nna-ya buru uzọ ka àka.
3 Otú a ayi onwe-ayi kwa, mb͕e ayi bu umu ọhu, ọ bu n'okpuru ihe-ozizí mbu nke uwa ka ejidere ayi dika orù
4 ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu,
5 ka O we b͕aputa ndi nọ n'okpuru iwu, ka ayi we nata idi-ka-umu-ndikom ahu.
6 Ma n'ihi na unu bu umu-ndikom, Chineke ziputara Mọ nke Ọkpara-Ya ba nime obi-ayi, nēti nkpu, si, Aba, Nna.
7 Ya mere i bughi orù ọzọ, kama i bu nwa-nwoke; ma ọ buru na i bu nwa-nwoke, i bu kwa onye-nketa site n'aka Chineke.
8 Otú ọ di, mb͕e ahu, ebe unu nāmataghi Chineke, unu bu orù nke ndi nābughi chi dika ha si puta n'uwa: