1 Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi,
2 nēdegara ndi nọ na Kọlọsi akwukwọ, bú umu-nna-ayi nime Kraist ndi di nsọ kwe-kwa-ra ekwe: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, puta.
3 Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile,
4 ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile,
5 n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,
6 nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu;
7 dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi,