16 Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:
17 nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist.
18 Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu,
19 ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n'otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.
20 Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere,
21 Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka
22 (bú ihe agēmebi ha nile emebi n'iji ha me ihe), dika ihe enyere n'iwu na ozizí madu si di?