13 nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a:
14 ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.
15 Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele.
16 Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.
17 Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya.
18 Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi.
19 Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ.