2 Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele;
3 nēkpe-kwa-nu ekpere n'ihi ayi n'otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m'nọ kwa n'ab͕u n'ihi ya;
4 ka m'we me ka ọ puta ìhè, dika m'nāghaghi ikwu ya.
5 Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.
6 Ka okwu-unu di n'amara mb͕e nile, ihe eji nnú me ka ọ di utọ, ka unu we mata otú unu nāghaghi iza madu nile ọ bula.
7 Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:
8 onye m'nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.