11 ndi anāghaghi imechi ọnu-ha; ha bu madu ndi nēkpù madu dum di n'èzí-na-ulo iru, nēzí ihe nke nēkwesighi ka ha zí, n'ihi urù nēweta ihere.
12 Otù onye n'etiti ha, bú onye-amuma nke aka ha, siri, Ndi Krit bu ndi-ugha mb͕e dum, anu-ọhia jọrọ njọ, ndi afọ-nri nādighi-alu ọlu.
13 Àmà nka bu ezi-okwu. N'ihi ihe a were kwa aka ike tu ha nmehie-ha n'anya, ka ha we nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi,
14 ka ha ghara iṅa nti akukọ-irò ihe di iche nke ndi-Ju, na ihe di iche iche nke madu nyere n'iwu, bú ndi nēchighari rapu ezi-okwu ahu.
15 Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha.
16 Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.