1 Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,
2 ka ha ghara ikwulu onye ọ bula, ghara ibu ndi nālu ọ̀gù, ka ha nwe obi-ọma, nēgosi idi-nwayọ nile n'ebe madu nile nọ.
3 N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.
4 Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n'anya-Ya n'ebe madu nọ,