11 ebe i matara na atughariwo obi madu di otú a, ọ nēmehie kwa, ebe ọ bu onye mara onwe-ya ikpé.
12 Mb͕e ọ bula m'gēzitere gi Atemas, ma-ọbu Tikikọs, were inu-ọku-n'obi biakutem rue Naikọpọlis: n'ihi na n'ebe ahu ka m'zubeworo inọgide na mb͕e oyi.
13 Were inu-ọku-n'obi dupu Zinas onye-iwu na Apọlos n'ije-ha, ka ihe ọ bula ghara ifọdu nke ha nēnweghi.
14 Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n'ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.
15 Ndi nile mu na ha nọ nēkele gi. Kele ndi huru ayi n'anya n'okwukwe.Ka amara dinyere unu nile.