24 Netan we si, Onye-nwem, bú eze, Ọ̀ bu gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem?
25 N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.
26 Ma ọ kpọghm, ọbuná mu onwem, bú orù-gi, ọ kpọghi kwa Zedok, bú onye-nchu-àjà, ọ kpọghi kwa Benaia nwa Jehoiada, ọ kpọghi kwa Solomon, bú orù-gi.
27 Ọ̀ gābu na ihe a sitere n'aka onye-nwem, bú eze, ma i meghi ka ndi-orù-gi mara onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri?
28 Eze, bú Devid, we za, si, Kpọrọnum Bat-sheba. O we bata n'iru eze, guzo n'iru eze.
29 Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,
30 n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta.