1. Ndi-Eze 2 IGBOB

1 Ma ubọchi Devid biaruru nso ka ọ nwua; o we nye Solomon, bú nwa-ya, iwu, si,

2 Mu onwem nēje n'uzọ uwa nile: ma di ike, buru kwa nwoke;

3 debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, bú Chineke-gi, ije n'uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n'iwu Moses si di, ka i we nwe uche n'ihe ọ bula nke i nēme, na n'ebe ọ bula i nēche iru-gi:

4 ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru.

5 Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua.

6 Gi me kwa dika amam-ihe-gi si di, ma ekwela ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'udo.

7 Ma mere umu Bazilai, bú onye Gilead, ebere, ka ha di kwa n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi: n'ihi na otú a ka ha biakuterem mb͕e m'b͕apuru n'iru Absalom, bú nwa-nne-gi.

8 Ma, le, ọ di n'aka-gi, bú Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke Bahurim, onye ya onwe-ya kọcharam nkọcha jọb͕uru onwe-ya n'ubọchi m'jere Mahanaim: ma ya onwe-ya ridara izutem na Jọdan, m'we were Jehova ṅuara ya iyi, si, M'gaghi-ewere mma-agha me ka i nwua ma-ọli.

9 Ma ub͕u a agula ya n'onye ikpe nāmaghi, n'ihi na onye mara ihe ka i bu; i gāmara kwa ihe i gēme ya, ma i gēme ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'ọbara.

10 Devid we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid.

11 Ma ubọchi Devid bu eze Israel di ọgu arọ abua: arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem.

12 Solomon we nọkwasi n'oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku.

13 Adonaija nwa Hagit we biakute Bat-sheba nne Solomon. Ọ si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? Ọ si, Ọ bu n'udo.

14 Ọ si kwa, Enwerem okwu igwa gi. Ọ si, Kwue.

15 Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.

16 Ma ub͕u a otù aririọ ka mu onwem nāriọ n'aka-gi, achughachila irum. Ọ si ya Kwue.

17 Ọ si, Biko, si Solomon, bú eze, (n'ihi na ọ gaghi-achughachi iru-gi,) ka o nyem Abishag, bú nwayi Shunem, na nwunye.

18 Bat-sheba we si, Ọ di nma; mu onwem gāgwara gi eze okwu.

19 Bat-sheba we bakuru eze, bú Solomon, igwa ya okwu bayere Adonaija. Eze we bilie izute ya, we kpọ isi ala nye ya, nọkwasi n'oche-eze-ya, dọbara nne eze oche-eze; o we nọdu n'aka-nri-ya.

20 Ọ si, Ọ bu aririọ ntà ka mu onwem nāriọ n'aka-gi; achughachila irum. Eze we si ya, Riọ, nnem: n'ihi na m'gaghi-achughachi iru-gi.

21 Ọ si, Ka ewere Abishag, bú nwayi Shunem, nye Adonaija, bú nwa-nne-gi, na nwunye.

22 Eze, bú Solomon, we za, si nne-ya, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāriọrọ Adonaija Abishag, bú nwayi Shunem? riọ-kwa-ra ya ala-eze; n'ihi na ya onwe-ya bu nwa-nnem nke-okenye; riọrọ ya ala-eze, riọ-kwa-ra Abaiata, bú onye-nchu-àjà, riọ-kwa-ra Joab nwa Zeruaia.

23 Eze, bú Solomon, we were Jehova ṅua iyi, si, Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ọ bughi imegide ndu-ya ka Adonaija kwuworo okwu a.

24 Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta.

25 Eze, bú Solomon, we zìe ozi n'aka Benaia nwa Jehoiada; o we dakwasi ya, o we nwua.

26 Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.

27 Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.

28 Akukọ ahu we rue Joab nti: n'ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n'azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n'azu. Joab we b͕alaga n'Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà.

29 Ewe gosi eze, bú Solomon, si, Joab ab͕alagawo n'Ulo-ikwū Jehova, ma, le, ọ nọ n'akuku ebe-ichu-àjà. Solomon we ziga Benaia nwa Jehoiada, si, Je, dakwasi ya.

30 Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n'ebe a ka m'gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram.

31 Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri.

32 Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.

33 Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.

34 Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara.

35 Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n'ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n'ọnọdu Abaiata.

36 Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n'ebe ahu, esi-kwa-la n'ebe ahu pua je ebe ọ bula.

37 O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi.

38 Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi.

39 O rue, n'ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat.

40 Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi.

41 Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa.

42 Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Èmeghm ka i were Jehova ṅua iyi, m'we b͕ara gi àmà, si, Mara nke-ọma, na i ghaghi inwu n'ubọchi i gāpu je n'ebe ọ bula? i we sim, Ọ di nma, bú okwu m'nuru.

43 Ọ̀ bu kwa gini mere i nēdebeghi iyi Jehova, na ihe enyere n'iwu nke m'nyere gi n'iwu?

44 Eze si-kwa-ra Shimai, Gi onwe-gi mara ihe ọjọ nile nke obi-gi mara, nke i mere Devid, bú nnam: Jehova gēme kwa ka ihe ọjọ gi laghachi n'isi-gi.

45 Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi.

46 Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22