27 Ọ̀ gābu na ihe a sitere n'aka onye-nwem, bú eze, ma i meghi ka ndi-orù-gi mara onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri?
28 Eze, bú Devid, we za, si, Kpọrọnum Bat-sheba. O we bata n'iru eze, guzo n'iru eze.
29 Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,
30 n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta.
31 Bat-sheba we rube isi kpuchie iru-ya n'ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
32 Eze, bú Devid, we si, Kpọrọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Netan, bú onye-amuma, kpọ kwa Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n'iru eze.
33 Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon: