12 Ọ bu nání na ọ bughi n'ubọchi-gi ka M'gēme ya, n'ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n'aka nwa-gi ka M'gādọwapu ya.
13 Otú ọ di, ọ bughi ala-eze-gi nile ka M'gādọwapu; otù ebo ka M'gēnye nwa-gi, n'ihi Devid, bú orùm, na n'ihi Jerusalem, nke M'rọputaworo.
14 Jehova we me ka onye-nmegide biliere Solomon, bú Hedad, onye Edom: na nkpuru eze n'Edom ka o sitere.
15 O rue, mb͕e Devid nọ n'Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n'Edom;
16 (n'ihi na ọnwa isi ka Joab na Israel nile nọduru n'ebe ahu, rue mb͕e o bipusiri nwoke ọ bula n'Edom;)
17 Hedad we b͕alaga, ya onwe-ya na ndikom Edom ufọdu n'etiti ndi-orù nna-ya tiyere ya, ibà n'Ijipt; ma Hedad bu nwa-okoro ntà.
18 Ha we si na Midian bilie, biarue Peran: ha we si na Peran chiri ndikom tiyere onwe-ha, bata n'Ijipt, biakute Fero, bú eze Ijipt; o we nye ya ulo, si ka enye ya nri, o nye-kwa-ra ya ala.