22 Fero we si ya, Ma gini nākọ gi onwe-gi n'ebe m'nọ, na, le, i nācho ila n'ala-gi? Ọ si, Ọ dighi ihe kọrọm: otú ọ di, zilagam nọ̄.
23 Chineke we me ka onye-nmegide ọzọ biliere ya, bú Rezon nwa Eliada, onye b͕anariri Hedadeza eze Zoba, bú onye-nwe-ya:
24 ọ chikọta ndikom n'ebe ọ nọ, ghọ onye-isi usu ndi nāpunara madu ihe, mb͕e Devid buru ndi Zoba: ha we jerue Damaskọs, biri nime ya, buru eze na Damaskọs.
25 Ọ we ghọrọ Israel onye-nmegide ubọchi nile nke Solomon, tiyere ihe ọjọ nke Hedad mere: ike Israel we gwusia ya, o we buru eze Siria.
26 Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze.
27 Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya.
28 Nwoke ahu, bú Jeroboam, bu dike nke bu dìnkpà: Solomon we hu nwa-okorọbia ahu, na onye nēje ozi nke-ọma ka ọ bu, o we me ya ka ọ buru onye-nlekọta ibū nile nke ulo Josef.