35 ma M'gēwepu ala-eze n'aka nwa-ya, were ya nye gi, bú ebo iri.
36 Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu.
37 Ma gi ka M'gēwere, i gābu kwa eze n'ihe nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike, i gābu kwa eze Israel.
38 O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M'gēnye gi n'iwu, ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, me ihe ziri ezi n'anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M'gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M'wuru Devid, M'gēnye kwa gi Israel.
39 M'gēweda kwa nkpuru Devid n'ihi nka, ma ọ bughi ubọchi nile.
40 Solomon we chọ ime ka Jeroboam nwua: Jeroboam we bilie, b͕alaga n'Ijipt jekuru Shaishak, bú eze Ijipt, ọ we nọ n'Ijipt rue ọnwu Solomon.
41 Ma okwu Solomon nile nke fọduru, na ihe nile O mere, na amam-ihe-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ okwu Solomon?