37 Ma gi ka M'gēwere, i gābu kwa eze n'ihe nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike, i gābu kwa eze Israel.
38 O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M'gēnye gi n'iwu, ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, me ihe ziri ezi n'anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M'gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M'wuru Devid, M'gēnye kwa gi Israel.
39 M'gēweda kwa nkpuru Devid n'ihi nka, ma ọ bughi ubọchi nile.
40 Solomon we chọ ime ka Jeroboam nwua: Jeroboam we bilie, b͕alaga n'Ijipt jekuru Shaishak, bú eze Ijipt, ọ we nọ n'Ijipt rue ọnwu Solomon.
41 Ma okwu Solomon nile nke fọduru, na ihe nile O mere, na amam-ihe-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ okwu Solomon?
42 Ma ubọchi nile Solomon bu eze Israel nile nime Jerusalem di ọgu arọ abua.
43 Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.