6 Solomon we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, o jesozughi kwa Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.
7 Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n'ugwu nke di n'iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon.
8 Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà.
9 Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,
10 Onye nye-kwa-ra ya iwu bayere ihe a, ka ọ ghara ijeso chi ọzọ: ma o debeghi ihe ahu nke Jehova nyere n'iwu.
11 Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi.
12 Ọ bu nání na ọ bughi n'ubọchi-gi ka M'gēme ya, n'ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n'aka nwa-gi ka M'gādọwapu ya.