9 Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,
10 Onye nye-kwa-ra ya iwu bayere ihe a, ka ọ ghara ijeso chi ọzọ: ma o debeghi ihe ahu nke Jehova nyere n'iwu.
11 Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi.
12 Ọ bu nání na ọ bughi n'ubọchi-gi ka M'gēme ya, n'ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n'aka nwa-gi ka M'gādọwapu ya.
13 Otú ọ di, ọ bughi ala-eze-gi nile ka M'gādọwapu; otù ebo ka M'gēnye nwa-gi, n'ihi Devid, bú orùm, na n'ihi Jerusalem, nke M'rọputaworo.
14 Jehova we me ka onye-nmegide biliere Solomon, bú Hedad, onye Edom: na nkpuru eze n'Edom ka o sitere.
15 O rue, mb͕e Devid nọ n'Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n'Edom;