1 Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n'okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n'akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
2 O we kpọ òkù megide ebe-ichu-àjà ahu n'okwu Jehova, si, Ebe-ichu-àjà, ebe-ichu-àjà, otú a ka Jehova siri: Le, agāmuru ulo Devid otù nwa-nwoke, Josaia bu aha-ya; ọ gāchu kwa n'elu gi ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu gi, ọkpukpu madu ka ha gēsure kwa ọku n'elu gi.
3 O nye-kwa-ra ihe-iriba-ama n'ubọchi ahu, si, Nka bu ihe-iriba-ama ahu nke Jehova kwuworo: Le, agāb͕awa ebe-ichu-àjà nka, wusi kwa ntu nke di n'elu ya.
4 O rue, mb͕e eze nuru okwu onye nke Chineke ahu, nke ọ kpọrọ megide ebe-ichu-àjà nime Bet-el, na Jeroboam siri n'ebe-ichu-àjà setipu aka-ya, si, Jidenu ya. Aka-ya, nke o setiri imegide ya, we kpọnwua, ọ pughi kwa iseghachi ya n'aru ya.