12 Ma gi onwe-gi bilie, la n'ulo-gi: mb͕e ukwu-gi nābà n'obodo, nwata ahu gānwu kwa.
13 Ma Israel nile gētiri ya aka n'obi, lìe ya; n'ihi na onye a, nání ya, nime ndi Jeroboam nwere gābiaru ílì: n'ihi na ahuru nime ya ezi ihe n'ebe Jehova, bú Chineke Israel, nọ, n'ulo Jeroboam.
14 Jehova gēme kwa ka otù eze Israel biliere Ya, onye gēbipu ulo Jeroboam ubọchi a: ma gini? ọbuná ub͕u a.
15 Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n'ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n'ofè Osimiri; n'ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe.
16 Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.
17 Nwunye Jeroboam we bilie, la, biarue Tiaza: mb͕e nwayi ahu nābata na nbata-uzọ ulo, nwa-okoro ahu we nwua.
18 Israel nile we lìe ya, tiere ya aka n'obi; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye-amuma.